JỌN 4:39-42
JỌN 4:39-42 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.” Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ. Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya. Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
JỌN 4:39-42 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere. Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua. Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne; ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie.