Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 4:30-54

JỌN 4:30-54 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya. Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.” Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.” Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?” Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya. Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ. Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’ E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.” Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.” Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ. Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya. Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.” Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili. (Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.) Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ. Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.” Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.” Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere. Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

JỌN 4:30-54 Bible Nso (IGBOB)

Ha siri n'obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya. Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe. Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri? Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya. Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha. Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù. N'ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi. Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha. Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere. Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua. Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne; ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie. Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili. N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya. Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu. Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum. Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu. Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli. Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi. Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya. Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu. Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya. Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum. Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.