JỌN 4:11-26
JỌN 4:11-26 Bible Nso (IGBOB)
Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri. Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a. Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di: n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma. Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem. Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem. Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta. Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya. Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu. Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile. Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya.
JỌN 4:11-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a. Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?” Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ. Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.” Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.” Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di. I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.” Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma. Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.” Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem. Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu. Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.” Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.” Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”