JỌN 3:34-36
JỌN 3:34-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju. Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya. Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
Kesaa
Gụọ JỌN 3JỌN 3:34-36 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ. Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka. Onye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya.
Kesaa
Gụọ JỌN 3