JỌN 3:31-34
JỌN 3:31-34 Bible Nso (IGBOB)
Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu. Ihe nke ọ huworo na nke Ọ nuru, nka ka Ọ nāb͕a àmà; ma ọ dighi onye ọ bula nānara àmà-Ya. Onye nara àmà-Ya kara akàrà-ya na nka, na Chineke bu Onye ezi-okwu. N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.
JỌN 3:31-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile. Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya. Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu. Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.