Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 21:7-19

JỌN 21:7-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”

JỌN 21:7-19 Bible Nso (IGBOB)

Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri. Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya. Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha. Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a. Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi. Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n'ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi. Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu. Nka mere ya ub͕ò atọ emere ka Jisus puta ìhè nye ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e emesiri ka O si na ndi nwuru anwu bilie. Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri. Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum. Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri. N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi. Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som.