JỌN 21:1-6
JỌN 21:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
JỌN 21:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n'oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a. Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe. Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n'ub͕ọ-ha; ma n'abali ahu ha egbughi ihe ọ bula. Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n'ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus. Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è. O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya.