JỌN 20:19-23
JỌN 20:19-23 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu. Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi. Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ: ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.
JỌN 20:19-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”