JỌN 2:13-22
JỌN 2:13-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.” Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.” Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.” Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.” Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?” Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
JỌN 2:13-22 Bible Nso (IGBOB)
Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem. Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala: O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru; Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia. Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam. Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia? Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu. Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ? Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya. Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.