JỌN 18:33-40
JỌN 18:33-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.” Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya. Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?” Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.
JỌN 18:33-40 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n'onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem? Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere? Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta. Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum. Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu? Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju? Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.