JỌN 18:19-24
JỌN 18:19-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya. Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo. Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.” Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.” Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
JỌN 18:19-24 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya. Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo. Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru. Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a? Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka? Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.