JỌN 17:14-19
JỌN 17:14-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.
JỌN 17:14-19 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu. Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu. Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa. N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu.