JỌN 16:19-24
JỌN 16:19-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ. Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa. Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu. Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke.
JỌN 16:19-24 Bible Nso (IGBOB)
Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam? N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù. Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa. Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu. N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham. Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.