JỌN 15:9-11
JỌN 15:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
Kesaa
Gụọ JỌN 15JỌN 15:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Dika Nnam hurum n'anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n'anya: nọgidenu nime ihu-n'anyam. Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya. Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa.
Kesaa
Gụọ JỌN 15