JỌN 15:5-7
JỌN 15:5-7 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya. Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku. Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.
JỌN 15:5-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.