JỌN 15:18-27
JỌN 15:18-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ “Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
JỌN 15:18-27 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì. Ọ buru na unu sitere n'uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n'anya: ma n'ihi na unu esiteghi n'uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n'ihi nka uwa nākpọ unu asì. Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu. Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem. Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha. Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì. Ọ buru na alughm ọlu n'etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì. Ma nka mere, ka okwu edeworo n'iwu-ha we mezu, Ha kpọrọm asì n'efu. Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà: unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n'ihi na Mu na unu nọ site na mbu.