JỌN 15:1-16
JỌN 15:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m. “Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
JỌN 15:1-16 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi. Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari. Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu. Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n'onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n'osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem. Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya. Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku. Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya. Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm. Dika Nnam hurum n'anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n'anya: nọgidenu nime ihu-n'anyam. Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya. Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa. Nka bu ihe M'nyere n'iwu ka unu hurita ibe-unu n'anya, dika M'huru unu n'anya. Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya. Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu. Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara. Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.