JỌN 14:27-29
JỌN 14:27-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. “Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m. Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.
JỌN 14:27-29 Bible Nso (IGBOB)
Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ. Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku. Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru.