JỌN 13:21-27
JỌN 13:21-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya. Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso. Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya. Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?” Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt. Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.”
JỌN 13:21-27 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, na otù onye n'etiti unu gāraram nye. Ndi nēso uzọ-Ya nēlerita onwe-ha anya, nēnwe obi abua onye Ọ nēkwu okwu bayere ya. Otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n'obi Jisus, onye Jisus huru n'anya. Ya mere Saimon Pita fere onye ahu isi, we si ya, Gwa ayi onye O nēkwu okwu bayere ya. Onye ahu dabere, otú ọ di, n'obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu? Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot. Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.