JỌN 13:15-17
JỌN 13:15-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.
Kesaa
Gụọ JỌN 13JỌN 13:15-17 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu. N'ezie, n'ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku. Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.
Kesaa
Gụọ JỌN 13