JỌN 13:13-15
JỌN 13:13-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
Kesaa
Gụọ JỌN 13JỌN 13:13-15 Bible Nso (IGBOB)
Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n'ihi na ọ bu otú M'di. Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu. N'ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu.
Kesaa
Gụọ JỌN 13