JỌN 13:12-18
JỌN 13:12-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha. “Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’
JỌN 13:12-18 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M'meworo unu? Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n'ihi na ọ bu otú M'di. Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu. N'ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu. N'ezie, n'ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku. Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha. Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.