JỌN 13:1-7
JỌN 13:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ. Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha. Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?” Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.”
JỌN 13:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile. Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye, Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù. Mb͕e ahu O tinye miri n'ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n'úkwù hicha ukwu-ha. Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.