JỌN 12:9-19
JỌN 12:9-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs. Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!” Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, “Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.” Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a. Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ. Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”
JỌN 12:9-19 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie. Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs; n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus. N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem, ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel. Ma mb͕e Jisus chọtasiri otù nwa-inyinya-ibu, Ọ nọkwasi ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Atula egwu, ada Zaion: le, Eze-gi nābia, nānọkwasi nwa inyinya-ibu. Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia. Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n'ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà. Ọ bu kwa n'ihi nka ka ìgwè madu ahu puru izute Ya, n'ihi na ha nuru na O mereri ihe-iriba-ama nka. Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n'ihe: le, uwa ejesowo Ya n'azu.