JỌN 12:37-41
JỌN 12:37-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?” Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.” Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
JỌN 12:37-41 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya: ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ, O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.