JỌN 12:20-26
JỌN 12:20-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
JỌN 12:20-26 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi-Grik ufọdu di n'etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n'ememe ahu: ya mere madu ndia biakutere Filip, nke bu onye Betsaida nke Galili, ha we kpere ya, si, Onye-nwe-ayi, ayi nāchọ ihu Jisus. Filip bia gwa Andru: Andru we bia, ya na Filip, ha we gwa Jisus. Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru. Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi. Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.