Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 11:32-44

JỌN 11:32-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu. Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.” Jisọs ebee akwa. Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.” Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?” Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya. Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?” Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m. Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.” Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!” Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”

JỌN 11:32-44 Bible Nso (IGBOB)

Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri, O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa. Anya-miri puru n'anya Jisus. Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya! Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu? Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya. Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru. Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke? Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum. Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem. Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí. Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.