JỌN 10:1-11
JỌN 10:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
JỌN 10:1-11 Bible Nso (IGBOB)
N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa. Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha. Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya.