JEREMAIA 49:1-22
JEREMAIA 49:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile? N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù. Gini mere i ji ndagwurugwu nile anya isi? ndagwurugwu-gi nērùpu dika miri, gi ada nke nādaghachi azu, nke nātukwasi obi n'àkù-ya nile, si, Ònye gābiakutem? Le, M'gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n'iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari. Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya? B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya. Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n'abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha? N'ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu. Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu. N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi. Akukọ ka m'nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n'etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha. N'ihi na, le, mba di ntà ka M'meworo gi n'etiti mba nile, bú ihe-nlelì n'etiti madu. Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile. Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya. Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum? N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha. Site n'olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n'Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya. Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.
JEREMAIA 49:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile? Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru. “Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ. Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ. “Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure? Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ. Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ? Ma aga m agba Ịsọ ọtọ. Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile ka ọ ghara izobe onwe ya. Ụmụ ya na ndị ikwu ya, tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi. Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị, ‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ” Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.” “Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.” Anụla m ozi si nʼọnụ ONYENWE ANYị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!” Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ. Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu, na nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu, gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya. A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya. “Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka ONYENWE ANYị kwuru. “Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” Nʼihi nke a, nụrụ ihe ONYENWE ANYị kwadobere megide Edọm, nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha; iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie. Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa. Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.