JEREMAIA 31:31-32
JEREMAIA 31:31-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Lee, oge na-abịa,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 31JEREMAIA 31:31-32 Bible Nso (IGBOB)
Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu: ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 31