JEREMAIA 31:3-6
JEREMAIA 31:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya. Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu ONYENWE ANYị Chineke anyị.’ ”
JEREMAIA 31:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi. M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua. I gāku kwa ubi-vine ọzọ n'elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha. N'ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n'ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi.