JEREMAIA 29:11-13
JEREMAIA 29:11-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka ONYENWE ANYị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 29JEREMAIA 29:11-13 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 29