JEREMAIA 29:10-14
JEREMAIA 29:10-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a. Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka ONYENWE ANYị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m. Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
JEREMAIA 29:10-14 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a. N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm. M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.