JEREMAIA 25:15-17
JEREMAIA 25:15-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya. Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.” Ya mere, esi m nʼaka ONYENWE ANYị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 25JEREMAIA 25:15-17 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru. Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti ha. M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 25