JEREMAIA 17:9-11
JEREMAIA 17:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya? “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.” Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
JEREMAIA 17:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya? Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di. Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.