JEREMAIA 16:12-13
JEREMAIA 16:12-13 Bible Nso (IGBOB)
unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti: M'gātupu kwa unu n'elu ala nka tukwasi unu n'ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n'ebe ahu ehihie na abali; n'ihi na M'gaghi-emere unu amara.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 16JEREMAIA 16:12-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi. Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 16