JEREMAIA 1:9-14
JEREMAIA 1:9-14 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi: le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe. Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Nkpa-n'aka nke osisi almond ka m'nāhu. Jehova we sim, I huwo nke-ọma: n'ihi na onye nāmu anya ka M'bu n'ebe okwum di ime ya. Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ite afunwuworo ọku n'okpuru ya ka m'nāhu; iru-ya site-kwa-ra n'Ugwu. Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka.
JEREMAIA 1:9-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ. Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.” Mgbe ahụ, okwu nke ONYENWE ANYị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.” Okwu ONYENWE ANYị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.” ONYENWE ANYị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a.