NDI-IKPE 8:1-17
NDI-IKPE 8:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu. Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza? Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ. Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike. Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.” Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?” Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe ONYENWE ANYị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.” O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara. Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.” Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ. Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha. Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile. Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ. Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ. Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ” O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe. Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.
NDI-IKPE 8:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike. Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza? N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu. Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu. O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n'ukwu n'ukwu ob͕e achicha; n'ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian. Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri? Gideon we si, N'ihi nka mb͕e Jehova gēnye Zeba na Zalmuna n'akam, m'gēwere kwa ogwu nke ọzara were kwa ùgà ticha anu-aru-unu. O si n'ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya. O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a. Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha. Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha. Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji. Gideon nwa Joash we si n'agha ahu site na nrigo Heres lata. Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n'akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa. O we biakute ndikom Sukot, si, Le Zeba na Zalmuna, ndi unu taram uta bayere ha, si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye ndikom-i ndi nāda #mbà nri. O were ndi-okenye obodo ahu, na ogwu ọzara na ùgà, o were ha me ka ndikom Sukot mara ihe. Ọ kwatu ulo-elu Penuel, b͕ue ndikom obodo ahu.