NDI-IKPE 7:16-25
NDI-IKPE 7:16-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya. Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere. Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere ONYENWE ANYị, dịnyekwara Gidiọn.’ ” Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche. Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha ONYENWE ANYị, na mma agha Gidiọn!” Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga. Mgbe ha fụrụ narị opi ike atọ ndị ahụ, ONYENWE ANYị mere ka ndị ikom niile nọ nʼakụkụ niile nke ọmụma ụlọ ikwu ahụ tụgharịa were mma agha gburịta onwe ha. Ndị agha ahụ gbapụrụ ọsọ gbara gaa Bet-Shita nʼụzọ Zerera, gbarukwaa nke oke ala Ebel-Mehola, nke dị nso Tabat. A kpọpụtara ndị Izrel si Naftalị, na Asha na Manase niile ka ha pụta chụso ndị Midia ọsọ. Gidiọn ziri ozi nʼala ugwu ugwu Ifrem sị ha, “Pụtanụ gbochie ụzọ niile ndị Midia si agbafe. Cheenụ ọnụ mmiri Jọdan niile nche ruo na Bet-Bara.” Ya mere, a kpọpụtara ndị ikom niile nọ na Ifrem, bụ ndị gbochiri mmiri Jọdan ruo na Bet-Bara. Ha jidekwara ọchịagha ndị Midia abụọ, ndị aha ha bụ Oreb na Zeeb. Ha gburu Oreb nʼelu nkume nke na-aza aha ya ruo taa. E gbukwara Zeeb nʼebe a na-azọcha vaịnị. Ebe ahụ na-azakwa aha Zeeb ruo taa. Ha bipụrụ Oreb na Zeeb isi buru ha jekwuru Gidiọn nʼakụkụ osimiri Jọdan.
NDI-IKPE 7:16-25 Bible Nso (IGBOB)
O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu. Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme. Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon. Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n'aka-ha. Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n'aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n'aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon. Ha we guzo, nwoke ọ bula n'ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga. Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat. Ndikom Israel we si Naftali, na n'Asha, na nime Manase nile, kpọkọta onwe-ha, chua Midian n'azu. Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan. Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n'oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n'ofè Jọdan.