NDI-IKPE 6:36-40
NDI-IKPE 6:36-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa, lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.” Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi. Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.” Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.
NDI-IKPE 6:36-40 Bible Nso (IGBOB)
Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo, le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n'ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n'ala nile buruburu, m'gāmara kwa na I gēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo. O we di otú a: o we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n'aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri. Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m'kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m'were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n'ala nile buruburu. Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.