NDI-IKPE 6:12-16
NDI-IKPE 6:12-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmụọ ozi ONYENWE ANYị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, ONYENWE ANYị nọnyeere gị.” Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka ONYENWE ANYị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, ONYENWE ANYị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.” Ma ONYENWE ANYị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”
NDI-IKPE 6:12-16 Bible Nso (IGBOB)
Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà. Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian. Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i? Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam. Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke.