Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 5:1-31

NDI-IKPE 5:1-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị, “Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu ONYENWE ANYị! “Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye ONYENWE ANYị, bụ Chineke Izrel. “ONYENWE ANYị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata. E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu ONYENWE ANYị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu ONYENWE ANYị, Chineke Izrel. “Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga. Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel. Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla. Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu ONYENWE ANYị! “Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke ONYENWE ANYị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke ONYENWE ANYị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo. ‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’ “Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke ONYENWE ANYị bịakwutere m imegide ndị dị ike. Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta. Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche. Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche. Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri. Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ. “Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha. Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera. Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm! Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ! Ma Mmụọ ozi ONYENWE ANYị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere ONYENWE ANYị aka imeri ndị iro ya.’ “Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ. “Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’ Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị, ‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’ “ONYENWE ANYị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.

NDI-IKPE 5:1-31 Bible Nso (IGBOB)

Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si, N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel, N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha, Gọzienu Jehova. Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi; Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem; M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma. Jehova, mb͕e I siri na Sia puta, Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije, Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri, Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri. Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova, Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel. N'ubọchi Shamga nwa Anat, N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi, Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ. Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi, Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri, Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri. Ha rọputara chi ọhu di iche iche; Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile: Àhuru ọta ma-ọbu ube N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel? Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ, Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel: Gọzienu Jehova. Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu, Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda, Unu na ndi nēje ije n'uzọ, Tugharinu uche. N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile. Teta, teta, Debora; Teta, teta, kwue okwu abù: Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam. Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara; Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike. Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida. Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora; Dika Isaka si di, otú a ka Berak di; Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua. Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nzube obi di. N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi, Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu? Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nnyocha obi di. Gilead biri n'ofè Jọdan: Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o? Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri, Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi. Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu, Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia. Ndi-eze biara, bū agha; Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha, Nime Teanak n'akuku miri Megido: Ọ dighi urù ego ha nara. N'elu-igwe ka ha si bū agha, Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha. Miri-iyi Kaishon bupuru ha, Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon. Nkpuru-obim, i nāzọda ike. Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike. Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike. Agāgọzi Jael kari ndinyom, Bú nwunye Heba onye-Kenait, Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya. Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya; O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube. Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú, Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike; O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi, O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya. N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ: N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da: Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì. Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu, Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe, Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia? Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu? Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya, E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile, Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara? Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.