Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 2:1-23

NDI-IKPE 2:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mmụọ ozi ONYENWE ANYị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu, unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a? Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’ ” Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ ONYENWE ANYị aja nʼebe ahụ. Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị. Ndị Izrel fere ONYENWE ANYị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke ONYENWE ANYị rụụrụ ndị Izrel. Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi ONYENWE ANYị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri. E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash. Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị ONYENWE ANYị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel. Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYị site nʼife Baal ofufe. Ha gbakụtara ONYENWE ANYị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo ONYENWE ANYị iwe. Ha gbakụtara ONYENWE ANYị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe. Ya mere, ONYENWE ANYị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide. Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka ONYENWE ANYị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu. Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, ONYENWE ANYị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere. Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ ONYENWE ANYị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu ONYENWE ANYị dị. Ma mgbe ọbụla ONYENWE ANYị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na ONYENWE ANYị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha. Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị, agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ. Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ ONYENWE ANYị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.” ONYENWE ANYị hapụrụ mba ndị ahụ niile ka ha nọgide. Ọ chụpụghị ha ngwangwa site na inyefe ha nʼaka Joshua.

NDI-IKPE 2:1-23 Bible Nso (IGBOB)

Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n'Ijipt rigota, M'we me ka unu bata n'ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M'we si, M'gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara; ma unu onwe-unu na ndi bi n'ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo? M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà. O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá. Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu. Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu. Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel. Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash. Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel. Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim òfùfè: ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe. Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ. Ebe ọ bula ha puru, aka Jehova adigide ha ime ha ihe ọjọ, dika Jehova kwuru, na dika Jehova ṅuru ha iyi: ewe kpab͕ue ha nke-uku. Jehova we me ka ndi-ikpé bilie, ha we zọputa ha n'aka ndi nāpunara ha ihe. Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a. Ma mb͕e Jehova mere ka ndi-ikpe biliere ha, Jehova nọye-kwara-ra onye-ikpe ahu, we zọputa ha n'aka ndi-iro-ha ubọchi nile nke onye-ikpe ahu: n'ihi na Jehova cheghariri uche n'ihi isu-ude-ha n'iru ndi nēmeb͕u ha nākpab͕u kwa ha. O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu. Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N'ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyeworo ndi bu nna-ha n'iwu, n'ihi na ha egeghi kwa nti olum; Mu onwem agaghi-anapu kwa onye ọ bula ala-ya n'iru ha ọzọ site na mba nile ndi Joshua rapuru mb͕e ọ nwuru: ka M'we were ha nwa Israel, ma ha nēdebe uzọ Jehova ije ije nime ya, dika ndi bu nna-ha debere ya, ma-ọbu na ha edebeghi ya. Jehova we rapu mba ahu, ghara inapu ha ala-ha ngwa ngwa; O nyeghi kwa ha n'aka Joshua.