NDI-IKPE 11:29-40
NDI-IKPE 11:29-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, mmụọ ONYENWE ANYị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta kwere ONYENWE ANYị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m, ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke ONYENWE ANYị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.” Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. ONYENWE ANYị nyekwara ya mmeri dị ukwuu. O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn. Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ. Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m ONYENWE ANYị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.” Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere ONYENWE ANYị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere ONYENWE ANYị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.” Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru. Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel, na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.
NDI-IKPE 11:29-40 Bible Nso (IGBOB)
Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon. Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie, o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m'siri n'umu Amon lata n'udo, Jehova gēnwe ya, m'gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n'aka-ya. Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n'Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n'iru umu Israel. Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya. O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu. Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n'ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-gi, bú n'aru umu Amon. O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m'we je rida rue n'elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m'nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem. Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu. O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel, na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.