Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 11:1-28

NDI-IKPE 11:1-28 Bible Nso (IGBOB)

Ma Jefta, bú onye Gilead, bu dike nke bu dìnkpà, ma ya onwe-ya bu nwa nwayi nākwa iko: ma Gilead muru Jefta. Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n'ulo nna-ayi; n'ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu. Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha. O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob: ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u? Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m'lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n'irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi? Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di. Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa. Jefta we ziè ndi-ozi jekuru eze umu Amon, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, na i biakutewom ibuso alam agha? Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo. Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ: ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon: n'ihi na mb͕e ha siri n'Ijipt rigota, Israel we je ije n'ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh; Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m'gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh. O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab. Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem. Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha. Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n'aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n'ala ahu. Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n'Anon we rue Jabok, site kwa n'ọzara we rue Jọdan. Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n'iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha? Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta. Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli? Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu? Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon. Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya.

NDI-IKPE 11:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna. Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.” Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya. O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.” Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?” Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.” Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na ONYENWE ANYị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?” Ndị okenye Gilead zara, “ONYENWE ANYị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu ONYENWE ANYị nʼobodo Mizpa. Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?” Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.” Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha. Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh. Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh. “Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya. “Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’ Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha. “Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ. Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan. “Ma ugbu a, ONYENWE ANYị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ? Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla ONYENWE ANYị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta. Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha? Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ? Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka ONYENWE ANYị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.” Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.