JEMES 5:7-9
JEMES 5:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu. Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso. Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n'iru ọnu-uzọ.
JEMES 5:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.