Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEMES 5:1-20

JEMES 5:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a. Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya. Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu. Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ. Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị. Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko. Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma. Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto. Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire. Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri. Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ, chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.

JEMES 5:1-20 Bible Nso (IGBOB)

Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu. Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo. Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu. Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha. Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u. Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu. Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu. Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso. Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n'iru ọnu-uzọ. Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi. Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere. Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu. Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya. Elaija bu madu yiri ayi n'aru-ya, o we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezoghi kwa n'ala arọ atọ na ọnwa isi. O we kpe ekpere ọzọ; elu-igwe we nye miri-ozuzo, ala we mia nkpuru-ya. Umu-nnam, asi na onye ọ bula n'etiti unu si n'ezi-okwu jehie, ma otù onye we me ka o chigharia; ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.