Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEMES 3:1-18

JEMES 3:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Unu aghọla ọtutu ndi-ozizí, umu-nnam, ebe unu matara na ayi gānata ikpé ka uku. N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga. Ma ọ buru na ayi etiye bridle inyinya-ayi n'ọnu-ha, ka ha we kweyere ayi, ayi nēchighari kwa aru-ha dum. Le, ub͕ọ kwa, ọ bu ezie na ha di uku otú a, oké ifufe nēfeghari kwa ha, ma umara isi-ub͕ọ dikarisiri ntà nēchighari ha, ebe ọ bula uche onye-isi ub͕ọ nāchọ. Otú a ire bu kwa ihe ntà di n'aru, ọ nānya kwa isi oké ihe. Le, otú oké ọhia ra uku, bú nke ọku dikarisiri ntà nēme ka o nwuru ọku! Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku. N'ihi na aha nile ọ bula nke anu na anu-ufe, nke ihe nākpu akpu na ihe di n'oké osimiri, ha nile ka ihe akpọrọ madu nēmeju anya, o mejuwo kwa ha anya: ma ọ dighi onye ọ bula n'etiti madu puru imeju ire anya; ọ bu ihe ọjọ nke nādighi-eguzo n'otù ebe, ọ bu ihe juputara na irè-agwọ nēweta ọnwu. Ọ bu nka ka ayi ji nāgọzi Onye-nwe-ayi, bú Nna-ayi; nka ka ayi ji kwa nābu madu ọnu, ndi ekèworo dika oyiyi Chineke si di: n'otù ọnu ahu ka ngọzi na ọbubu-ọnu si puta. Umu-nnam, o kwesighi ka ihe ndia di otú a. Ìsi-iyi nēsi n'otù ọnu ahu suputa miri nātọ utọ na miri nēlu ilu? Umu-nnam, ọ̀ gābu na osisi fig puru imi olive, ma-ọbu na osisi vine puru imi fig? miri nnú apughi kwa isuputa miri nātọ utọ. Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe. Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu. Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí. N'ihi na ebe ekworo na ikpa-iche-iche di, n'ebe ahu ka ib͕a-aghara na omume nile ọ bula nke nādighi nma di. Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua. Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.

JEMES 3:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike. Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka. Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ. Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya. Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta? Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ. Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala. Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu. Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ. Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị. Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya. Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.