JEMES 2:1-17
JEMES 2:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Umu-nnam, unu enwela okwukwe nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nwe ebube, n'ile-madu-anya-n'iru. N'ihi na asi na otù nwoke nke yiri nb͕a-aka ọla-edo na uwe mara nma nke-uku bata na nzukọ-unu, ma asi na otù ob͕eye nke yiri uwe ruru inyi bata kwa; ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum; ùnu enweghi obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọghi kwa ndi-ikpé nēchè èchìchè ọjọ? Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya? Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé? Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu? Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma: ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie. N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara. N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu. Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé. N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi. Ùrù gini ka ọ bara, umu-nnam, ma ọ buru na onye ọ bula asi na o nwere okwukwe, ma o nweghi ọlu? òkwukwe ahu puru izọputa ya? Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi, ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara? Ọbuná otú a okwukwe, ma ọ buru na o nweghi ọlu, ọ bu ihe nwuru anwu n'onwe-ya.
JEMES 2:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya. Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.