JEMES 1:19-27
JEMES 1:19-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme. Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
JEMES 1:19-27 Bible Nso (IGBOB)
Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe: n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke. N'ihi nka tupunu inyi nile na njubiga-ókè nile nke ihe ọjọ, were-kwa-nu nwayọ nara okwu ahu nke akuworo nime unu dika n'ubi, nke puru izọputa nkpuru-obi-unu. Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu. N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya: n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu. Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu. Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.